1Nke a bụ okwu Onyenwe anyị nke bịaara Maịka, onye Moreshet, nʼoge eze Jotam, Ehaz na Hezekaya, bụ ndị eze Juda. Ọhụ nke ọ hụrụ banyere Sameria na Jerusalem.
2Geenụ ntị, unu ndị mmadụ, unu niile, gee ntị, gị ụwa na ndị niile bi nʼime ya ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị gbaa akaebe megide unu, bụ Onyenwe anyị site nʼụlọnsọ ukwu ya.
3Lee! Onyenwe anyị na-abịa! O si nʼebe obibi ya na-abịa. Ọ na-abịa ma na-azọda ebe niile dị elu nke ụwa.
4Ugwu ukwu niile na-agbaze nʼokpuru ụkwụ ya, ndagwurugwu niile na-agbawa, dịka abụba dị nso nʼọkụ, dịka mmiri si nʼebe dị elu na-asọdata
5Ihe ndị a bụ nʼihi njehie Jekọb, nʼihi mmehie niile nke ndị Izrel. Gịnị bụ njehie Jekọb? Ọ bụghị Sameria? Gịnịkwa bụ ebe dị elu nke Juda? Ọ bụghị Jerusalem?