Maika 1

Nʼihi na ọnya ya enweghị ngwọta, o rutela na Juda. O rutelarị ma nʼọnụ ụzọ ama nke ndị m, rukwaarị Jerusalem.

Micah 1:9 (UKJV) For her wound is incurable; for it has come unto Judah; he has come unto the gate of my people, even to Jerusalem.

7Arụsị ha niile a pịrị apị ka a ga-akụjisi; onyinye niile a na-ewebata nʼụlọ arụsị ha ka a ga-akpọ ọkụ. Aga m ala arụsị niile ya a kpụrụ akpụ nʼiyi. Ebe ọ bụ na e si nʼaka ndị na-agba akwụna na-ewebata onyinye ndị a, a ga-eji ha kwụọ ụgwọ ịgba akwụna.”

8Nʼihi nke a, aga m akwa akwa, tikwaa mkpu akwa. Aga m agbara ọtọ gbarakwa ụkwụ efu jegharịa. Aga m akpọ mkpu dịka nkịta ọhịa, tipụkwa ube akwa dịka ikwighịkwighị.

9Nʼihi na ọnya ya enweghị ngwọta, o rutela na Juda. O rutelarị ma nʼọnụ ụzọ ama nke ndị m, rukwaarị Jerusalem.

10Unu ekwutela okwu ya na Gat; unu akwakwala akwa ọbụla. Tụrụọnụ onwe unu nʼuzuzu, unu ndị Bet-Ofra.

11Gabiganụ nʼụzọ unu, unu ndị bi na Shafia. Nʼọnọdụ ịgba ọtọ na ihere unu, unu ndị bi na Zaanan abịakwala nso. Ndị Bet-Ezel na-eru ụjụ nʼihi na e wezugala ndị na-eche unu nche.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.