8Nʼihi nke a, aga m akwa akwa, tikwaa mkpu akwa. Aga m agbara ọtọ gbarakwa ụkwụ efu jegharịa. Aga m akpọ mkpu dịka nkịta ọhịa, tipụkwa ube akwa dịka ikwighịkwighị.
9Nʼihi na ọnya ya enweghị ngwọta, o rutela na Juda. O rutelarị ma nʼọnụ ụzọ ama nke ndị m, rukwaarị Jerusalem.
10Unu ekwutela okwu ya na Gat; unu akwakwala akwa ọbụla. Tụrụọnụ onwe unu nʼuzuzu, unu ndị Bet-Ofra.
11Gabiganụ nʼụzọ unu, unu ndị bi na Shafia. Nʼọnọdụ ịgba ọtọ na ihere unu, unu ndị bi na Zaanan abịakwala nso. Ndị Bet-Ezel na-eru ụjụ nʼihi na e wezugala ndị na-eche unu nche.
12Ndị bi na Marot nọ nʼoke ahụ mgbu na-eche ka ihe ọma bịa, nʼihi na mbibi esitela nʼaka Onyenwe anyị bịa, ruo nʼọnụ ụzọ ama Jerusalem