2unu bụ ndị kpọrọ ezi ihe asị ma na-ahụ ajọ ọrụ nʼanya. Unu na-agba ndị m akpụkpọ na ndụ na-agbapụkwa anụ ahụ kpuchiri ọkpụkpụ ha.
3Unu na-erida anụ ahụ ndị nke m, na-agba ha akpụkpọ, na-etijisi ọkpụkpụ ha, na-egburi anụ ahụ ha, dịka anụ a na-esinye nʼite.”
4Mgbe ahụ ha ga-akpọku Onyenwe anyị, ma ọ gaghị aza ha! Mgbe oge ahụ bịaruru, ọ ga-ezo ihu ha site nʼebe ha nọ nʼihi ihe ọjọọ nke ha mere.
5Ihe a ka Onyenwe anyị kwuru: “Banyere ndị amụma bụ ndị na-eduhie ndị m, mgbe ha nwere ihe ha ga-eri, ha na-ekwusa ‘Udo’ ma ọ bụrụ na mmadụ enyeghị ha nri, ha na-ebili buo agha megide onye dị otu a.
6Ya mere nʼabalị ga-abịakwasị ha, napụ ha ike ịhụ ọhụ; ọchịchịrị ga-ekpuchi ha, ka ha ghara ịjụta ase ọbụla. Anwụ ga-ada nʼebe ndị amụma ahụ nọ, ụbọchị ga-agbakwa ọchịchịrị nye ha.