1Mgbe ahụ ekwuru m sị, “Geenụ ntị unu ndịisi ụlọ Jekọb, na unu ndị na-achị ezinaụlọ Izrel. Ọ bụ na unu ekwesighị ịmata ikpe ziri ezi
2unu bụ ndị kpọrọ ezi ihe asị ma na-ahụ ajọ ọrụ nʼanya. Unu na-agba ndị m akpụkpọ na ndụ na-agbapụkwa anụ ahụ kpuchiri ọkpụkpụ ha.
3Unu na-erida anụ ahụ ndị nke m, na-agba ha akpụkpọ, na-etijisi ọkpụkpụ ha, na-egburi anụ ahụ ha, dịka anụ a na-esinye nʼite.”
4Mgbe ahụ ha ga-akpọku Onyenwe anyị, ma ọ gaghị aza ha! Mgbe oge ahụ bịaruru, ọ ga-ezo ihu ha site nʼebe ha nọ nʼihi ihe ọjọọ nke ha mere.