9Aka gị ga-adị elu na mmeri nke ndị iro ya, a ghakwaghị ịla ndị iro gị niile nʼiyi.
10“Nʼụbọchị ahụ kwa,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri, “Aga m ala ịnyịnya unu nʼiyi site nʼetiti unu, kụjisiekwa ụgbọala unu niile.
11Aga m ala obodo niile dị nʼala unu nʼiyi, dọdasịakwa ebe unu niile e wusiri ike.
12Aga m ala mgbaasị unu nʼiyi, unu agaghị enwekwa ndị na-ajụ mmụọ ọjọọ ase.
13Aga m ala arụsị a pịrị apị unu niile nʼiyi, ya na nkume nsọ ahụ niile dị nʼetiti unu. Unu agakwaghị akpọ isiala nye ihe unu ji aka unu kpụọ.