6Onye ga-eji mma agha chịa ala Asịrịa, jirikwa mma agha a mịpụtara amịpụta chịa ala Nimrọd. Ọ ga-anapụta anyị site nʼaka ndị Asịrịa ahụ, mgbe ha ga-eji ike bata nʼala anyị, ma zọrọkwa ije gafee oke ala anyị.
7Mgbe ahụ, ndị fọdụrụ afọdụ nke Jekọb ga-adị nʼetiti ọtụtụ ndị mmadụ, dịka igirigi si nʼebe Onyenwe anyị nọ abịa, maọbụ dịka mmiri ozuzo ntakịrị na-ezokwasị ahịhịa, nke na-adịghị ele anya mmadụ maọbụ chere ụmụ mmadụ.
8Ndị fọdụrụ afọdụ nke Jekọb ga-adịkwa nʼetiti ọtụtụ ndị mmadụ dị ka ọdụm nʼetiti anụ ọhịa niile dị iche iche, e, dịka nwa ọdụm nʼetiti igwe atụrụ, nke na-azọda na-adọkasị mgbe ọ na-agabiga, ma o nweghị onye ga-anapụta ya.
9Aka gị ga-adị elu na mmeri nke ndị iro ya, a ghakwaghị ịla ndị iro gị niile nʼiyi.
10“Nʼụbọchị ahụ kwa,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri, “Aga m ala ịnyịnya unu nʼiyi site nʼetiti unu, kụjisiekwa ụgbọala unu niile.