4Ọ ga-eguzo zụọ igwe ewu na atụrụ ya, site nʼike nke Onyenwe anyị, na site nʼịdị ukwuu nke aha Onyenwe anyị Chineke ya. Ndị ya ga-anọkwa na-enweghị nsogbu, nʼihi na ịdị ukwuu ya ga-eru na nsọtụ niile nke ụwa.
5Ọ ga-abụkwa udo anyị. Mgbe ndị Asịrịa ga-abata nʼala anyị nʼike, sikwa nʼebe niile e wusiri ike nke anyị na-agafe, anyị ga-ahọpụta ndị ọzụzụ atụrụ asaa, ọ bụladị ndịisi asatọ.
6Onye ga-eji mma agha chịa ala Asịrịa, jirikwa mma agha a mịpụtara amịpụta chịa ala Nimrọd. Ọ ga-anapụta anyị site nʼaka ndị Asịrịa ahụ, mgbe ha ga-eji ike bata nʼala anyị, ma zọrọkwa ije gafee oke ala anyị.
7Mgbe ahụ, ndị fọdụrụ afọdụ nke Jekọb ga-adị nʼetiti ọtụtụ ndị mmadụ, dịka igirigi si nʼebe Onyenwe anyị nọ abịa, maọbụ dịka mmiri ozuzo ntakịrị na-ezokwasị ahịhịa, nke na-adịghị ele anya mmadụ maọbụ chere ụmụ mmadụ.
8Ndị fọdụrụ afọdụ nke Jekọb ga-adịkwa nʼetiti ọtụtụ ndị mmadụ dị ka ọdụm nʼetiti anụ ọhịa niile dị iche iche, e, dịka nwa ọdụm nʼetiti igwe atụrụ, nke na-azọda na-adọkasị mgbe ọ na-agabiga, ma o nweghị onye ga-anapụta ya.