Nehum 2

Onye na-ebuso gị agha na-abịakwasị gị. Chee ebe gị niile e wusiri ike nche. Chee ụzọ niile nche, mee ka ụkwụ gị sie ike nʼala. Chịkọtakwa ike gị niile.

Nahum 2:1 (UKJV) He that dashes in pieces has come up before your face: keep the stronghold, watch the way, make your loins strong, fortify your power mightily.

1Onye na-ebuso gị agha na-abịakwasị gị. Chee ebe gị niile e wusiri ike nche. Chee ụzọ niile nche, mee ka ụkwụ gị sie ike nʼala. Chịkọtakwa ike gị niile.

2Onyenwe anyị ga-eme ka ịma mma Jekọb laghachi, dịka ịma mma nke Izrel ọ bụ ezie na ndị mbibi ebibiela ha, lakwaa alaka osisi vaịnị ha niile nʼiyi.

3Ọta ndị agha ya na-acha ọbara ọbara, ndị bụ dike nʼagha yikwa uwe na-acha uhie uhie. Igwe e ji wuo ụgbọ agha na-egbu amụma nʼụbọchị ahụ ha na-ejikere agha, otu a kwa, ha na-efegharịkwa ùbe ha eji osisi fịa mee.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.