Nehemaya 10

“Anyị bụ ndị nchụaja, ndị Livayị na ndị ọzọ, ejirila ife nza chọpụta mgbe ezinaụlọ ọbụla nʼetiti anyị ga-eji bubata nku nʼụlọ Chineke anyị nʼoge ya kwa afọ, maka ebe ịchụ aja nke Onyenwe anyị Chineke anyị dịka e dere ya nʼiwu.

Nehemiah 10:34 (UKJV) And we cast the lots among the priests, the Levites, and the people, for the wood offering, to bring it into the house of our God, after the houses of our fathers, at times appointed year by year, to burn upon the altar of the LORD our God, as it is written in the law:

32“Anyị kwekọrịtakwara na anyị ga-atụ ụtụ otu ụzọ nʼime ụzọ atọ nke otu shekel afọ niile maka iji kwadoo ọrụ ụlọnsọ ukwu Chineke,

33maka ime ka ihe ndị a dịrị nʼụlọnsọ ukwu ahụ: achịcha nsọ, onyinye ọka nke ụbọchị niile, aja nsure ọkụ na onyinye nke ụbọchị izuike, mmemme ọnwa ọhụrụ niile, ha na mmemme ndị ọzọ niile a kara aka, maka aja dị nsọ niile na aja ikpuchi mmehie ndị Izrel, maka ozi niile a na-aga nʼụlọnsọ Chineke anyị.

34“Anyị bụ ndị nchụaja, ndị Livayị na ndị ọzọ, ejirila ife nza chọpụta mgbe ezinaụlọ ọbụla nʼetiti anyị ga-eji bubata nku nʼụlọ Chineke anyị nʼoge ya kwa afọ, maka ebe ịchụ aja nke Onyenwe anyị Chineke anyị dịka e dere ya nʼiwu.

35“Anyị kpebikwara na mmadụ niile nʼotu nʼotu ga na-ewebata mkpụrụ mbụ nke ihe ubi ya nʼụlọnsọ Onyenwe anyị, na mkpụrụ osisi ọbụla, maọbụ ihe ubi ndị ọzọ.

36“Dịka e dere ya nʼIwu, anyị ga-ewebata ụmụ ndị ikom mbụ anyị, na nwa mbụ nke igwe ehi, na igwe ewu na atụrụ anyị niile, nʼụlọ Chineke anyị. A ga-enye ha ndị nchụaja na-eje ozi nʼebe ahụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.