Nehemaya 10

“Dịka e dere ya nʼIwu, anyị ga-ewebata ụmụ ndị ikom mbụ anyị, na nwa mbụ nke igwe ehi, na igwe ewu na atụrụ anyị niile, nʼụlọ Chineke anyị. A ga-enye ha ndị nchụaja na-eje ozi nʼebe ahụ.

Nehemiah 10:36 (UKJV) Also the firstborn of our sons, and of our cattle, as it is written in the law, and the firstlings of our herds and of our flocks, to bring to the house of our God, unto the priests that minister in the house of our God:

34“Anyị bụ ndị nchụaja, ndị Livayị na ndị ọzọ, ejirila ife nza chọpụta mgbe ezinaụlọ ọbụla nʼetiti anyị ga-eji bubata nku nʼụlọ Chineke anyị nʼoge ya kwa afọ, maka ebe ịchụ aja nke Onyenwe anyị Chineke anyị dịka e dere ya nʼiwu.

35“Anyị kpebikwara na mmadụ niile nʼotu nʼotu ga na-ewebata mkpụrụ mbụ nke ihe ubi ya nʼụlọnsọ Onyenwe anyị, na mkpụrụ osisi ọbụla, maọbụ ihe ubi ndị ọzọ.

36“Dịka e dere ya nʼIwu, anyị ga-ewebata ụmụ ndị ikom mbụ anyị, na nwa mbụ nke igwe ehi, na igwe ewu na atụrụ anyị niile, nʼụlọ Chineke anyị. A ga-enye ha ndị nchụaja na-eje ozi nʼebe ahụ.

37“Karịsịa, anyị ga-ewebata nʼụlọ ịchịkọba ihe nke ụlọnsọ Chineke anyị, nyekwa ha ndị nchụaja, ụtụ ọka mbụ anyị kwọrọ, ya na onyinye ndị ọzọ nke mkpụrụ ubi mbụ anyị, dịka mmanya vaịnị mbụ, mmanụ oliv mbụ na mkpụrụ osisi ndị ọzọ. Anyị kpebikwara inye ndị Livayị otu ụzọ nʼime ụzọ iri nke ihe niile anyị nwetara nʼubi anyị, nʼihi na ọ bụ ọrụ ndị Livayị ịnakọta otu ụzọ nʼụzọ iri site nʼobodo niile ebe anyị na-arụ ọrụ.

38Ndị nchụaja bụ ụmụ ụmụ Erọn ga-eso ndị Livayị mgbe ha na-anakọta onyinye otu ụzọ nʼime ụzọ iri ndị a. Ha ga-ewekọta ihe ndị a niile webaa ha nʼụlọ Chineke anyị, ruo nʼime ọnụụlọ ịchịkọba ihe, nke ụlọakụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.