Nehemaya 10

Ndị Izrel na ndị Livayị, kwesiri iweta onyinye ọka ha, na mmanya vaịnị ọhụrụ, na mmanụ oliv nʼime ụlọ ịchịkọba ihe, nʼebe a na-edebe ngwongwo niile e ji eje ozi nʼụlọ ukwu ahụ, nke ndị nchụaja na-eje ozi, ndị nche na nke ndị ọbụ abụ. “Anyị agaghị agbakụtakwa ụlọ Chineke anyị azụ.”

Nehemiah 10:39 (UKJV) For the children of Israel and the children of Levi shall bring the offering of the corn, of the new wine, and the oil, unto the chambers, where are the vessels of the sanctuary, and the priests that minister, and the porters, and the singers: and we will not forsake the house of our God.

37“Karịsịa, anyị ga-ewebata nʼụlọ ịchịkọba ihe nke ụlọnsọ Chineke anyị, nyekwa ha ndị nchụaja, ụtụ ọka mbụ anyị kwọrọ, ya na onyinye ndị ọzọ nke mkpụrụ ubi mbụ anyị, dịka mmanya vaịnị mbụ, mmanụ oliv mbụ na mkpụrụ osisi ndị ọzọ. Anyị kpebikwara inye ndị Livayị otu ụzọ nʼime ụzọ iri nke ihe niile anyị nwetara nʼubi anyị, nʼihi na ọ bụ ọrụ ndị Livayị ịnakọta otu ụzọ nʼụzọ iri site nʼobodo niile ebe anyị na-arụ ọrụ.

38Ndị nchụaja bụ ụmụ ụmụ Erọn ga-eso ndị Livayị mgbe ha na-anakọta onyinye otu ụzọ nʼime ụzọ iri ndị a. Ha ga-ewekọta ihe ndị a niile webaa ha nʼụlọ Chineke anyị, ruo nʼime ọnụụlọ ịchịkọba ihe, nke ụlọakụ.

39Ndị Izrel na ndị Livayị, kwesiri iweta onyinye ọka ha, na mmanya vaịnị ọhụrụ, na mmanụ oliv nʼime ụlọ ịchịkọba ihe, nʼebe a na-edebe ngwongwo niile e ji eje ozi nʼụlọ ukwu ahụ, nke ndị nchụaja na-eje ozi, ndị nche na nke ndị ọbụ abụ. “Anyị agaghị agbakụtakwa ụlọ Chineke anyị azụ.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.