Nehemaya 11

Ugbu a, ndịisi Izrel bi nʼobodo nsọ Jerusalem nʼoge a, ma e sitere nʼife nza họpụta otu ụzọ nʼime ụzọ iri nke ndị bi nʼobodo ndị ọzọ niile ka ha bịa biri na Jerusalem, bụ obodo nsọ ahụ, ebe ụzọ itoolu fọdụrụ bikwa nʼobodo nke aka ha.

Nehemiah 11:1 (UKJV) And the rulers of the people dwelt at Jerusalem: the rest of the people also cast lots, to bring one of ten to dwell in Jerusalem the holy city, and nine parts to dwell in other cities.

1Ugbu a, ndịisi Izrel bi nʼobodo nsọ Jerusalem nʼoge a, ma e sitere nʼife nza họpụta otu ụzọ nʼime ụzọ iri nke ndị bi nʼobodo ndị ọzọ niile ka ha bịa biri na Jerusalem, bụ obodo nsọ ahụ, ebe ụzọ itoolu fọdụrụ bikwa nʼobodo nke aka ha.

2Ndị mmadụ toro ndị niile jiri afọ ofufu họrọ ịbịa soro biri na Jerusalem.

3Ndị a bụ ndịisi ala ahụ a na-achị achị ndị bịara biri na Jerusalem (ma ọtụtụ ndị Izrel, ndị nchụaja, ndị Livayị, ndị na-eje ozi nʼụlọnsọ na ụmụ ndị na-ejere Solomọn ozi biiri nʼobodo Juda, onye ọbụla nʼihe onwunwe ya nʼobodo ha dị iche iche.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.