Nehemaya 11

na ndị otu ya nʼọrụ ndị bụkwa dimkpa, dị otu narị na iri abụọ na asatọ (128) nʼọnụọgụgụ. Onyeisi ha bụ Zabdiel nwa Hagedolin.

Nehemiah 11:14 (UKJV) And their brethren, mighty men of valour, an hundred twenty and eight: and their overseer was Zabdiel, the son of one of the great men.

12Ọnụọgụgụ ndị ikom ha na ha na-arụkọ ọrụ nʼụlọ ukwu ahụ bụ narị asatọ na iri abụọ na abụọ (822). Adaya, nwa Jeroham, nwa Pelalaya, nwa Amzi, nwa Zekaraya, nwa Pashua nwa Malkija,

13na ndị ikom bụ ndịisi ezinaụlọ ndị so ya rụọ ọrụ dị narị abụọ na iri anọ na abụọ (242) nʼọnụọgụgụ, Amashaị nwa Azarel, nwa Ahazai, nwa Meshilemot, nwa Imea,

14na ndị otu ya nʼọrụ ndị bụkwa dimkpa, dị otu narị na iri abụọ na asatọ (128) nʼọnụọgụgụ. Onyeisi ha bụ Zabdiel nwa Hagedolin.

15Site na ndị Livayị: Shemaya nwa Hashub, nwa Azrikam, nwa Hashabaya, nwa Buni,

16na Shabetai, na Jozabad, mmadụ abụọ na ndị ndu ndị Livayị, ndị ọ bụ ha na-arụ ọrụ dị nʼezi nke ụlọ Chineke;

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.