Nehemaya 11

Onye na-elekọta ndị Livayị bi na Jerusalem bụ Uzi, nwa Bani, nwa Hashabaya, nwa Matanaya, nwa Matanaia, nwa Mika. Uzi bụ otu onye si nʼikwu Asaf, ndị ọbụ abụ maka ije ozi nke ụlọ Chineke.

Nehemiah 11:22 (UKJV) The overseer also of the Levites at Jerusalem was Uzzi the son of Bani, the son of Hashabiah, the son of Mattaniah, the son of Micha. Of the sons of Asaph, the singers were over the business of the house of God.

20Ndị fọdụrụ nʼIzrel, ha na ndị nchụaja, na ndị Livayị, nọ nʼobodo Juda niile, onye ọbụla nʼihe nketa ya.

21Ndị ahụ niile na-eje ozi nʼụlọnsọ bi nʼugwu Ofel. Ndịisi ha bụ Ziha na Gishpa.

22Onye na-elekọta ndị Livayị bi na Jerusalem bụ Uzi, nwa Bani, nwa Hashabaya, nwa Matanaya, nwa Matanaia, nwa Mika. Uzi bụ otu onye si nʼikwu Asaf, ndị ọbụ abụ maka ije ozi nke ụlọ Chineke.

23Eze họpụtara ndị ọbụ abụ nyekwa ha ọrụ ha kwesiri ịrụ ụbọchị niile.

24Petahaya nwa Meshezabel, onye bụ otu nʼagbụrụ Zera, nwa Juda, bụ onyeozi eze banyere ihe niile gbasara ndị mmadụ ahụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.