Nehemaya 12

Mgbe ndị nchụaja na ndị Livayị dochara onwe ha ọcha, ha dokwara ndị Izrel niile, na ọnụ ụzọ ama niile, na mgbidi ahụ ọcha.

Nehemiah 12:30 (UKJV) And the priests and the Levites purified themselves, and purified the people, and the gates, and the wall.

28Ndị ọbụ abụ sitekwara nʼobodo niile dị gburugburu Jerusalem bịa, ọ bụladị site nʼobodo niile ndị Netofa,

29na Bet-Gilgal, na akụkụ Geba na Azmavet, nʼihi na ha ewuorola onwe ha obodo nta dị iche iche gburugburu Jerusalem.

30Mgbe ndị nchụaja na ndị Livayị dochara onwe ha ọcha, ha dokwara ndị Izrel niile, na ọnụ ụzọ ama niile, na mgbidi ahụ ọcha.

31E mere m ka ndị ndu Juda niile rigoro nʼelu mgbidi ahụ. Nʼebe ahụ ka m kenyere otu ndị ọbụ abụ abụọ inye ekele. Otu ụzọ gara akụkụ aka nri nke elu mgbidi ahụ ruo nʼỌnụ Ụzọ Ama Ikpofu Ahịhịa.

32Hoshaya na ọkara ndị ndu Juda na-eso ha nʼazụ,

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.