Nehemaya 12

Ọ bụ nʼoge Devid na Asaf ka e bidoro inwe ndị ndu abụ ito na ikele Chineke.

Nehemiah 12:46 (UKJV) For in the days of David and Asaph of old there were chief of the singers, and songs of praise and thanksgiving unto God.

44Nʼoge ahụ ka a họpụtara ndị ikom na-elekọta ụlọ ịchịkọba ihe, ebe a na-achịkọba onyinye mkpụrụ mbụ, na onyinye otu ụzọ nʼụzọ iri. A na-esite nʼobodo gbara Jerusalem gburugburu na-ewebata nʼụlọ ịchịkọba ihe onyinye niile e nyere nʼiwu maka ọdịmma ndị nchụaja na ndị Livayị. E si otu a na-ewebata ya nʼihi na ọrụ ndị nchụaja na ndị Livayị na-arụ na-atọ ndị Juda ụtọ nke ukwuu.

45Nʼihi na ha na-arụ ọrụ Chineke ahụ ha ketara ịrụ, ya na ọrụ ido ndị mmadụ na ihe ọbụla nsọ. Otu a kwa ka ndị ọbụ abụ, na ndị na-eche nche sị arụkwa ọrụ a dịka iwu Devid na Solomọn nwa ya nyere si dị.

46Ọ bụ nʼoge Devid na Asaf ka e bidoro inwe ndị ndu abụ ito na ikele Chineke.

47Ya mere, nʼoge Zerubabel na Nehemaya, ndị Izrel niile na-ewebata onyinye e ji akwagide ọrụ ndị ọbụ abụ, na ndị nche, na ndị Livayị. Ha kewapụtakwara oke ruru ndị Livayị ndị ọzọ iche, ndị Livayị nʼonwe ha kwa, kewapụtara oke ruru ụmụ Erọn nʼime ihe e nyere ha dịka e si nye ya nʼiwu.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.