45Nʼihi na ha na-arụ ọrụ Chineke ahụ ha ketara ịrụ, ya na ọrụ ido ndị mmadụ na ihe ọbụla nsọ. Otu a kwa ka ndị ọbụ abụ, na ndị na-eche nche sị arụkwa ọrụ a dịka iwu Devid na Solomọn nwa ya nyere si dị.
46Ọ bụ nʼoge Devid na Asaf ka e bidoro inwe ndị ndu abụ ito na ikele Chineke.
47Ya mere, nʼoge Zerubabel na Nehemaya, ndị Izrel niile na-ewebata onyinye e ji akwagide ọrụ ndị ọbụ abụ, na ndị nche, na ndị Livayị. Ha kewapụtakwara oke ruru ndị Livayị ndị ọzọ iche, ndị Livayị nʼonwe ha kwa, kewapụtara oke ruru ụmụ Erọn nʼime ihe e nyere ha dịka e si nye ya nʼiwu.