Nehemaya 13

A chọpụtakwara m na-enyebeghị ndị Livayị oke ihe ruru ha, nke mere na ndị ọbụ abụ, na ndị nche ndị ọ bụ ọrụ ha i doo ofufe, alaghachila nʼubi ha dị iche iche.

Nehemiah 13:10 (UKJV) And I perceived that the portions of the Levites had not been given them: for the Levites and the singers, that did the work, were fled every one to his field.

8Iwe were m nke ukwuu, nke mere na m sitere nʼọnụụlọ ahụ tụpụsịa ngwongwo Tobaya niile nʼezi.

9Enyere m iwu ka e doo ọnụụlọ ndị ahụ niile ọcha, a chighachikwara m ngwongwo ụlọ Chineke niile nʼime ha, ha na onyinye mkpụrụ ọka, na ụda na-esi isi ụtọ ndị ahụ.

10A chọpụtakwara m na-enyebeghị ndị Livayị oke ihe ruru ha, nke mere na ndị ọbụ abụ, na ndị nche ndị ọ bụ ọrụ ha i doo ofufe, alaghachila nʼubi ha dị iche iche.

11Nʼihi ya, abaara m ha mba jụọ ha si: “Gịnị mere unu jiri gbakụta ụlọnsọ ukwu Chineke azụ?” Mgbe ahụ akpọghachiri m ndị Livayị nyekwa ha ọrụ ha nʼụlọnsọ.

12Ndị Juda niile bidokwara iweta ụtụ ha, na onyinye ọka, na mmanya vaịnị na mmanụ oliv ha nʼụlọ ịchịkọba ihe dị nʼụlọnsọ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.