Nehemaya 13

Iwe were m nke ukwuu, nke mere na m sitere nʼọnụụlọ ahụ tụpụsịa ngwongwo Tobaya niile nʼezi.

Nehemiah 13:8 (UKJV) And it grieved me sore: therefore I cast forth all the household stuff to Tobiah out of the chamber.

6Mgbe ihe ndị a na-eme, anọghị m na Jerusalem, nʼihi na nʼiri afọ atọ na abụọ nke ọchịchị Ataksekses, eze Babilọn, a lọghachikwutere m eze. Ma e mesịrị m nata ya ike

7laghachikwa na Jerusalem. Nʼebe a ka m nọ mata banyere ihe ọjọọ ahụ Eliashib mere, inye Tobaya otu ọnụụlọ nke dị nʼogige ụlọ Chineke ka ọ bụrụ ebe izuike ya.

8Iwe were m nke ukwuu, nke mere na m sitere nʼọnụụlọ ahụ tụpụsịa ngwongwo Tobaya niile nʼezi.

9Enyere m iwu ka e doo ọnụụlọ ndị ahụ niile ọcha, a chighachikwara m ngwongwo ụlọ Chineke niile nʼime ha, ha na onyinye mkpụrụ ọka, na ụda na-esi isi ụtọ ndị ahụ.

10A chọpụtakwara m na-enyebeghị ndị Livayị oke ihe ruru ha, nke mere na ndị ọbụ abụ, na ndị nche ndị ọ bụ ọrụ ha i doo ofufe, alaghachila nʼubi ha dị iche iche.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.