4Ma tupu ihe ndị a niile emee, Eliashib onye bụ onye nchụaja, onye e doro nʼisi ilekọta ime ụlọ a na-achịkọba ihe nʼụlọ Chineke anyị, ya na Tobaya nwee ezi mmekọrịta,
5o weere otu ọnụụlọ buru ibu a na-achịkọba ihe nye ya. Na mbụ, ọ bụ ọnụụlọ ebe a na-achịkọta onyinye ọka na ụda na-esi isi ụtọ, na ngwongwo ụlọnsọ, na efere mmanya ọhụrụ, na mmanụ oliv. Mosis enyelarị ya nʼiwu na ọ bụ ndị Livayị na ndị ọbụ abụ na ndị nche nwe onyinye ndị ahụ. Ndị nchụaja nwekwa oke nʼihe ndị a.
6Mgbe ihe ndị a na-eme, anọghị m na Jerusalem, nʼihi na nʼiri afọ atọ na abụọ nke ọchịchị Ataksekses, eze Babilọn, a lọghachikwutere m eze. Ma e mesịrị m nata ya ike
7laghachikwa na Jerusalem. Nʼebe a ka m nọ mata banyere ihe ọjọọ ahụ Eliashib mere, inye Tobaya otu ọnụụlọ nke dị nʼogige ụlọ Chineke ka ọ bụrụ ebe izuike ya.
8Iwe were m nke ukwuu, nke mere na m sitere nʼọnụụlọ ahụ tụpụsịa ngwongwo Tobaya niile nʼezi.