13E tinyere m Shelemaya onye nchụaja, na Zadọk ode akwụkwọ, na Pedaia onye Livayị, ka ha bụrụ ndị na-elekọta ụlọ ịchịkọba ihe niile ahụ. Emekwara m Hanan nwa Zakua, nwa Matanaya, onye ga na-enyere ha aka, nʼihi na a gụrụ ha dịka ndị kwesiri ntụkwasị obi. Ọrụ ha bụ ikere ndị Livayị ibe ha niile oke.
14Chineke m, biko cheta m nʼihi nke a, ehichapụkwala ihe niile m ji obi m niile rụọ nʼụlọnsọ gị na ije ozi niile ya.
15Nʼụbọchị ndị ahụ, ka m hụrụ na Juda ndị na-azọcha mmanya vaịnị nʼụbọchị izuike, ndị ji ịnyịnya ibu na-ebubata ogbe ọka, na-ebokwasị ha nʼelu ịnyịnya ibu, tinyekwara mmanya, na mkpụrụ vaịnị na fiig, na ibu niile ọbụla. Ha na-ebubatakwa ha nʼime Jerusalem nʼụbọchị izuike. Nke a mere m ji dọọ ha aka na ntị megide ire nri nʼụbọchị ahụ.
16Ndị si obodo Taịa, bụ ndị birila na Jerusalem nọ na-ebubata azụ na ngwa ahịa ndị ọzọ dị iche iche, na-ere ha na Juda, nakwa na Jerusalem nʼụbọchị izuike.
17A baara m ndị a na-asọpụrụ na Juda mba, si ha, “Gịnị bụ ihe ọjọọ nke a unu na-eme, na-emerụ ụbọchị izuike?