Nehemaya 13

A baara m ndị a na-asọpụrụ na Juda mba, si ha, “Gịnị bụ ihe ọjọọ nke a unu na-eme, na-emerụ ụbọchị izuike?

Nehemiah 13:17 (UKJV) Then I contended with the nobles of Judah, and said unto them, What evil thing is this that all of you do, and profane the sabbath day?

15Nʼụbọchị ndị ahụ, ka m hụrụ na Juda ndị na-azọcha mmanya vaịnị nʼụbọchị izuike, ndị ji ịnyịnya ibu na-ebubata ogbe ọka, na-ebokwasị ha nʼelu ịnyịnya ibu, tinyekwara mmanya, na mkpụrụ vaịnị na fiig, na ibu niile ọbụla. Ha na-ebubatakwa ha nʼime Jerusalem nʼụbọchị izuike. Nke a mere m ji dọọ ha aka na ntị megide ire nri nʼụbọchị ahụ.

16Ndị si obodo Taịa, bụ ndị birila na Jerusalem nọ na-ebubata azụ na ngwa ahịa ndị ọzọ dị iche iche, na-ere ha na Juda, nakwa na Jerusalem nʼụbọchị izuike.

17A baara m ndị a na-asọpụrụ na Juda mba, si ha, “Gịnị bụ ihe ọjọọ nke a unu na-eme, na-emerụ ụbọchị izuike?

18Ọ bụghị otu ihe a ka nna nna unu ha mere, nke mere na Chineke wetara ọdachi a tụkwasị anyị nakwa obodo a? Ugbu a, unu na-akpali ọnụma tụkwasị na nke dị megide Izrel site nʼimerụ ụbọchị izuike?”

19Nʼihi nke a, enyere m iwu na a ga-emechi ọnụ ụzọ ama Jerusalem nʼuhuruchi tupu ụbọchị izuike, ruo mgbe ụbọchị izuike gafesịrị. Emere m ka ụfọdụ ndị ohu m na-anọ na nche nʼebe ahụ, ịhụ na ọ dịghị onye ahịa ọbụla ga-abata nʼime obodo Jerusalem nʼụbọchị izuike.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.