17A baara m ndị a na-asọpụrụ na Juda mba, si ha, “Gịnị bụ ihe ọjọọ nke a unu na-eme, na-emerụ ụbọchị izuike?
18Ọ bụghị otu ihe a ka nna nna unu ha mere, nke mere na Chineke wetara ọdachi a tụkwasị anyị nakwa obodo a? Ugbu a, unu na-akpali ọnụma tụkwasị na nke dị megide Izrel site nʼimerụ ụbọchị izuike?”
19Nʼihi nke a, enyere m iwu na a ga-emechi ọnụ ụzọ ama Jerusalem nʼuhuruchi tupu ụbọchị izuike, ruo mgbe ụbọchị izuike gafesịrị. Emere m ka ụfọdụ ndị ohu m na-anọ na nche nʼebe ahụ, ịhụ na ọ dịghị onye ahịa ọbụla ga-abata nʼime obodo Jerusalem nʼụbọchị izuike.
20Ya mere, ndị na-azụ ahịa na ndị na-ere ụdị ngwa ahịa dị iche iche, na-anọ ọnọdụ abalị nʼazụ Jerusalem, otu gboro maọbụ ugboro abụọ.
21Ma a dọrọ ha aka na ntị, sị, “Gịnị ka unu ji na-anọ ọnọdụ abalị nʼakụkụ mgbidi a? Ọ bụrụ na unu eme ya ọzọ, aga m enye iwu ka e jide unu.” Site nʼụbọchị ahụ gaa nʼihu, ha abịakwaghị ọzọ nʼụbọchị izuike.