Nehemaya 3

Onye na-eso ya bụ Eza nwa Jeshua onyeisi ọchịchị obodo Mizpa. Ya na ndị otu ya rụziri akụkụ mgbidi ahụ dị na mgbago ebe ụlọ nchịkọta ngwa agha ruo na nkuku ya.

Nehemiah 3:19 (UKJV) And next to him repaired Ezer the son of Jeshua, the ruler of Mizpah, another piece opposite to the going up to the armoury at the turning of the wall.

17Ndị na-eso ya bụ ndị Livayị, ndị nke Rehum nwa Bani na-achịkọta. Onye ọzọ bụ Hashabaya onyeisi ọchịchị ọkara ndị bi na Keila. Ọ rụrụ ọrụ e kenyere ndị ya.

18Onye ọzọ na-eso ya bụ Binui nwa Henadad onye bụ onyeisi ọchịchị ọkara akụkụ Keila nke ọzọ. O du ndị Keila ibe ya rụọ ọrụ ha ketara.

19Onye na-eso ya bụ Eza nwa Jeshua onyeisi ọchịchị obodo Mizpa. Ya na ndị otu ya rụziri akụkụ mgbidi ahụ dị na mgbago ebe ụlọ nchịkọta ngwa agha ruo na nkuku ya.

20Onye ọzọ na-eso ya bụ Baruk, nwa Zabai, onye ji nnọọ ịnụ ọkụ nʼobi rụzie mgbidi ahụ site na nkuku ya ruo nʼọnụ ụzọ e si abata ụlọ Eliashib, bụ onyeisi nchụaja.

21Onye na-eso ya bụ Meremot nwa Ụraya, nwa Hakoz. Ọ sitere nʼọnụ ụzọ ụlọ Eliashib rụziri ruo na ngwụcha ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.