Nehemaya 3

Ndị ọzọ rụrụ ọrụ nʼakụkụ ha bụ Melataya, onye Gibiọn, na Jadon onye Meronot, na ndị si Gibiọn na Mizpa. Obodo ndị a dị nʼokpuru onyeisi ọchịchị akụkụ ọdịda anyanwụ Yufretis.

Nehemiah 3:7 (UKJV) And next unto them repaired Melatiah the Gibeonite, and Jadon the Meronothite, the men of Gibeon, and of Mizpah, unto the throne of the governor on this side the river.

5Akụkụ nke ọzọ ka ndị ikom Tekoa rụziri, ma ndị ha a na-asọpụrụ ekweghị ehudata ubu ha nye ọrụ ahụ nʼokpuru ndị nlekọta ha.

6Joiada nwa Pasea na Meshulam nwa Besodeia wuru Ọnụ Ụzọ Ama Jeshana. Ha tinyere osisi ya niile, kwụba ibo ọnụ ụzọ ya, ihe mkpọchi ya na ihe ntụchi ya niile nʼọnọdụ ha.

7Ndị ọzọ rụrụ ọrụ nʼakụkụ ha bụ Melataya, onye Gibiọn, na Jadon onye Meronot, na ndị si Gibiọn na Mizpa. Obodo ndị a dị nʼokpuru onyeisi ọchịchị akụkụ ọdịda anyanwụ Yufretis.

8Uziel nwa Hahaya, bụ ọkpụ ụzụ ọlaedo, doziri otu akụkụ. Onye na-eso ya bụ Hananaya, otu onye nʼime ndị na-eme mmanụ otite na-esi isi ọma, doziri nke na-esote nke ahụ. Ha doziri Jerusalem ruruo ya na Mgbidi Obosara.

9Onye na-eso ha bụ Refaya nwa Hua onyeisi ọchịchị otu akụkụ Jerusalem.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.