7Ndị ọzọ rụrụ ọrụ nʼakụkụ ha bụ Melataya, onye Gibiọn, na Jadon onye Meronot, na ndị si Gibiọn na Mizpa. Obodo ndị a dị nʼokpuru onyeisi ọchịchị akụkụ ọdịda anyanwụ Yufretis.
8Uziel nwa Hahaya, bụ ọkpụ ụzụ ọlaedo, doziri otu akụkụ. Onye na-eso ya bụ Hananaya, otu onye nʼime ndị na-eme mmanụ otite na-esi isi ọma, doziri nke na-esote nke ahụ. Ha doziri Jerusalem ruruo ya na Mgbidi Obosara.
9Onye na-eso ha bụ Refaya nwa Hua onyeisi ọchịchị otu akụkụ Jerusalem.
10Onye na-eso ya bụ Jedaya nwa Harumaf, onye rụrụ akụkụ mgbidi ahụ chere ihu nʼụlọ nke aka ya. Onye na-eso ya nʼọrụ a bụ Hatush nwa Hashabneia.
11Onye ọzọ bụ Malkija nwa Harim, na Hashub nwa Pahat-Moab, ndị wugharịrị ụlọ elu ọkụ, na otu akụkụ mgbidi ahụ.