6Iwe were m nke ukwuu mgbe m nụrụ mkpu akwa ha na mkpesa ndị a.
7Ya mere, mgbe m chesiri echiche banyere ya, e boro m ndị a na-asọpụrụ na ndị ọchịchị ebubo. A gwara m ha, “Unu na-anara ụmụnna unu ọmụrụnwa ego unu enyere ha.” Ya mere, a kpọrọ m nzukọ ọha mmadụ maka imegide ha.
8Nʼụbọchị nzukọ ahụ, agwara m ha okwu sị, “Ọtụtụ nʼime anyị na-agbalị nʼụzọ niile ịhụ na anyị zụtaghachiri ụmụnna anyị ndị Juu bu ndị e resiri ndị mba ọzọ. Ma unu nọ nʼebe a na-agbalị ime ha ka ha ghọọ ndị ohu unu. Ruo ole mgbe ka anyị ga-anọgide na-agbapụta ha site nʼọnọdụ ibu ohu?” Ma ha niile ekwughị okwu ọbụla, nʼihi na ha enweghị ihe ha ga-ekwu.
9Agwakwara m ha okwu ọzọ sị, “Ihe unu na-eme jọrọ njọ. O kwesighị ka unu tụọ egwu Chineke si otu a gbanarị nkọcha nke ndị iro anyị, bụ ndị mba ọzọ?”
10Mụ onwe m na ụmụnna m na ndị na-ejere m ozi na-agbazinye ụmụnne anyị ego na ọka. Ma ka anyị kwụsị ịnara ọmụrụnwa.