Nehemaya 6

E wuchara mgbidi ahụ nʼụbọchị iri abụọ na ise nke ọnwa Elul, nʼime iri ụbọchị ise na abụọ.

Nehemiah 6:15 (UKJV) So the wall was finished in the twenty and fifth day of the month Elul, in fifty and two days.

13E goro ya ọrụ ka o yinye m egwu, ka m site na-ime otu a mehie, mgbe ahụ, ha ga-ahụ ihe ha ga-eji nye m aha ọjọọ, kwaa m emo.

14“Chineke m, cheta Tobaya na Sanbalat, nʼihi ihe ndị a niile ha mere, chetakwa Noadaya, bụ onye amụma nwanyị, na ndị amụma ndị ọzọ niile fọdụrụ, bụ ndị ahụ chọrọ ime ka m tụọ egwu.”

15E wuchara mgbidi ahụ nʼụbọchị iri abụọ na ise nke ọnwa Elul, nʼime iri ụbọchị ise na abụọ.

16Mgbe ndị iro anyị niile nụrụ ya, mba niile ndị nọ anyị gburugburu tụrụ ụjọ, obi jụkwara ha oyi, nʼihi na ha matara na-arụrụ ọrụ a site nʼinyeaka Chineke.

17Ọzọ, nʼụbọchị ndị ahụ ndị Juda a na-asọpụrụ na e zigara Tobaya ọtụtụ akwụkwọ ozi, akwụkwọ ozi Tobaya na-erutekwa ha aka.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.