11Ma azara m si; “O kwesiri ka mụ onwe m bụ onyeisi ọchịchị gbaa ọsọ? O kwesiri ka mmadụ dịka m gbaa ọsọ gbaba nʼụlọnsọ Chineke ịzọpụta ndụ ya? Agaghị m aga.”
12Mgbe ahụ ka o doro m anya na Chineke agwaghị ya okwu ọbụla, kama na ọ bụ Tobaya na Sanbalat zụrụ ya.
13E goro ya ọrụ ka o yinye m egwu, ka m site na-ime otu a mehie, mgbe ahụ, ha ga-ahụ ihe ha ga-eji nye m aha ọjọọ, kwaa m emo.
14“Chineke m, cheta Tobaya na Sanbalat, nʼihi ihe ndị a niile ha mere, chetakwa Noadaya, bụ onye amụma nwanyị, na ndị amụma ndị ọzọ niile fọdụrụ, bụ ndị ahụ chọrọ ime ka m tụọ egwu.”
15E wuchara mgbidi ahụ nʼụbọchị iri abụọ na ise nke ọnwa Elul, nʼime iri ụbọchị ise na abụọ.