1Mgbe a gwara Sanbalat, na Tobaya, na Geshem onye Arab, na ndị iro anyị ndị ọzọ na m ewuzichaala mgbidi ahụ, na ọ dịkwaghị ntipu fọdụrụ na ya, ọ bụ ezie na nʼoge ahụ, etinyebeghị m ibo nʼọnụ ụzọ ama ya niile,
2Sanbalat na Geshem zitere m ozi a, “Bịa ka anyị zụkọta nʼotu obodo nta nke dị nʼobosara ala Ono.” Ma ha na-achọ ụzọ imerụ m ahụ.
3Ya mere, azara m ha site nʼaka ndị ozi sị, “Ana m arụ ọrụ dị oke mkpa, agaghị enwe ike ịrịdata. Nʼihi gịnị ka ọrụ a ga-eji kwụsị mgbe m ga-ahapụ ya ịbịa nʼebe ị nọ?”
4Ha zitere ozi ahụ ugboro anọ, ma enyere m ha otu ọsịsa ahụ ugboro anọ.
5Na nke ugboro ise, Sanbalat ziteere m onye na-ejere ya ozi, ya na akwụkwọ ozi nke e mechighị emechi o ji bịa.