Nehemaya 6

Na nke ugboro ise, Sanbalat ziteere m onye na-ejere ya ozi, ya na akwụkwọ ozi nke e mechighị emechi o ji bịa.

Nehemiah 6:5 (UKJV) Then sent Sanballat his servant unto me in like manner the fifth time with an open letter in his hand;

3Ya mere, azara m ha site nʼaka ndị ozi sị, “Ana m arụ ọrụ dị oke mkpa, agaghị enwe ike ịrịdata. Nʼihi gịnị ka ọrụ a ga-eji kwụsị mgbe m ga-ahapụ ya ịbịa nʼebe ị nọ?”

4Ha zitere ozi ahụ ugboro anọ, ma enyere m ha otu ọsịsa ahụ ugboro anọ.

5Na nke ugboro ise, Sanbalat ziteere m onye na-ejere ya ozi, ya na akwụkwọ ozi nke e mechighị emechi o ji bịa.

6Nke a bụ ihe e dere nʼime ya; “Anụla ya na mba niile, Geshem kwukwara otu ihe ahụ, na gị na ndị Juu na-akwado inupu isi. Ọ bụ ya mere i ji na-ewu mgbidi ahụ. Ozi ahụ na-ekwukwa na gị onwe gị na-achọ ịbụ eze ha,

7na ị họpụtala ndị amụma ndị ga-ekwupụta na Jerusalem na ị bụ eze ndị Juda. Ugbu a, ozi a ga-eru ntị eze, ya mere, bịa ka mụ na gị kparịtaa ụka nʼetiti onwe anyị.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.