Nehemaya 6

Nzube ha bụ ime ka ụjọ tụọ anyị. Ha na-echekwa sị, “Ha ga-ada mba nʼọrụ a ma hapụkwa ịrụcha ya.” Ma akpọkuru m Chineke sị ya, “Biko gbaa aka m ume.”

Nehemiah 6:9 (UKJV) For they all made us afraid, saying, Their hands shall be weakened from the work, that it be not done. Now therefore, O God, strengthen my hands.

7na ị họpụtala ndị amụma ndị ga-ekwupụta na Jerusalem na ị bụ eze ndị Juda. Ugbu a, ozi a ga-eru ntị eze, ya mere, bịa ka mụ na gị kparịtaa ụka nʼetiti onwe anyị.”

8Ma eziri m ya ozi sị, “O nweghị eziokwu ọbụla dị nʼihe ị na-ekwu, nʼihi na ha bụ ihe i chepụtara nʼobi gị.”

9Nzube ha bụ ime ka ụjọ tụọ anyị. Ha na-echekwa sị, “Ha ga-ada mba nʼọrụ a ma hapụkwa ịrụcha ya.” Ma akpọkuru m Chineke sị ya, “Biko gbaa aka m ume.”

10Otu ụbọchị, a gara m nʼụlọ Shemaya, nwa Delaya, nwa Mehetabel, onye e mechibidoro ụzọ nʼụlọ ya. Ọ sịrị m, “Ka anyị zukọta nʼụlọ Chineke, nʼime ụlọnsọ, ka anyị mechiekwa ụzọ niile nke ụlọnsọ ahụ, nʼihi na ndị ikom na-abịa igbu gị, e, nʼabalị ka ha na-abịa igbu gị.”

11Ma azara m si; “O kwesiri ka mụ onwe m bụ onyeisi ọchịchị gbaa ọsọ? O kwesiri ka mmadụ dịka m gbaa ọsọ gbaba nʼụlọnsọ Chineke ịzọpụta ndụ ya? Agaghị m aga.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.