Nehemaya 8

Ya mere, ndị ahụ pụrụ gaa weta alaka osisi, jiri ha wuore onwe ha ụlọ ahịhịa ha ga-ebi nwa mgbe nta nʼelu ụlọ ha, na nʼogige ụlọ nke aka ha, nakwa nʼogige ụlọ Chineke, na mbara ala Ọnụ Ụzọ Ama Mmiri, na nʼakụkụ Ọnụ Ụzọ Ama Ifrem.

Nehemiah 8:16 (UKJV) So the people went forth, and brought them, and made themselves booths, every one upon the roof of his house, and in their courts, and in the courts of the house of God, and in the street of the water gate, and in the street of the gate of Ephraim.

14Mgbe ha na-agụ ya, ha chọpụtara ebe Onyenwe anyị gwara Mosis sị ya na ụmụ Izrel kwesiri ibi nʼụlọ ikwu mgbe ọbụla a na-eme mmemme ụlọ ikwu nke a ga-eme nʼọnwa ahụ.

15O kwukwara na ha ga-ekwusa okwu a nʼobodo niile nke Juda na Jerusalem sị; “Gaanụ nʼala ugwu ugwu gbute alaka osisi oliv ụlọ, na alaka oliv ọhịa, na alaka osisi mietul, na alaka nkwụ, na alaka osisi ndị ọzọ na-enye ndo nke a ga-eji wuo ebe unu ga-ebi tutu ruo mgbe mmemme ahụ ga-agwụsị, dịka e dere ya nʼakwụkwọ iwu.”

16Ya mere, ndị ahụ pụrụ gaa weta alaka osisi, jiri ha wuore onwe ha ụlọ ahịhịa ha ga-ebi nwa mgbe nta nʼelu ụlọ ha, na nʼogige ụlọ nke aka ha, nakwa nʼogige ụlọ Chineke, na mbara ala Ọnụ Ụzọ Ama Mmiri, na nʼakụkụ Ọnụ Ụzọ Ama Ifrem.

17Ndị ahụ niile si na ndọta nʼagha lọta wuuru onwe ha ụlọ ikwu biri nʼime ya ụbọchị asaa ahụ niile e mere mmemme ahụ. Oke ọṅụ jupụtara obi mmadụ niile, nʼihi na site nʼoge Joshua nwa Nun ruo nʼoge a, o nwebeghị mgbe ụmụ Izrel mere mmemme a nʼụzọ dị otu a.

18Ezra na-agụpụta site nʼakwụkwọ iwu Chineke kwa ụbọchị, site nʼụbọchị mbụ ruo nʼụbọchị ikpeazụ. Ha mere mmemme ahụ ụbọchị asaa ma nʼụbọchị nke asatọ ha nwere ọgbakọ ofufe mmechi dịka e dere ya nʼiwu.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.