16Ya mere, ndị ahụ pụrụ gaa weta alaka osisi, jiri ha wuore onwe ha ụlọ ahịhịa ha ga-ebi nwa mgbe nta nʼelu ụlọ ha, na nʼogige ụlọ nke aka ha, nakwa nʼogige ụlọ Chineke, na mbara ala Ọnụ Ụzọ Ama Mmiri, na nʼakụkụ Ọnụ Ụzọ Ama Ifrem.
17Ndị ahụ niile si na ndọta nʼagha lọta wuuru onwe ha ụlọ ikwu biri nʼime ya ụbọchị asaa ahụ niile e mere mmemme ahụ. Oke ọṅụ jupụtara obi mmadụ niile, nʼihi na site nʼoge Joshua nwa Nun ruo nʼoge a, o nwebeghị mgbe ụmụ Izrel mere mmemme a nʼụzọ dị otu a.
18Ezra na-agụpụta site nʼakwụkwọ iwu Chineke kwa ụbọchị, site nʼụbọchị mbụ ruo nʼụbọchị ikpeazụ. Ha mere mmemme ahụ ụbọchị asaa ma nʼụbọchị nke asatọ ha nwere ọgbakọ ofufe mmechi dịka e dere ya nʼiwu.