Nehemaya 9

Nʼụbọchị nke iri abụọ na anọ nke otu ọnwa ahụ, ndị Izrel niile zukọkwara na obubu ọnụ, yiri uwe iru ụjụ, kpokwasịkwa onwe ha ntụ nʼisi.

Nehemiah 9:1 (UKJV) Now in the twenty and fourth day of this month the children of Israel were assembled with fasting, and with sack clothes, and earth upon them.

1Nʼụbọchị nke iri abụọ na anọ nke otu ọnwa ahụ, ndị Izrel niile zukọkwara na obubu ọnụ, yiri uwe iru ụjụ, kpokwasịkwa onwe ha ntụ nʼisi.

2Ndị si nʼagbụrụ Izrel wezugakwara onwe ha site nʼebe ndị mba ọzọ niile nọ. Ha guzoro nʼọnọdụ ha kwupụta mmehie ha na ajọ omume nke nna nna ha.

3Ha guzokwara nʼebe ahụ ha nọ gụọ site nʼakwụkwọ iwu nke Onyenwe anyị, bụ Chineke ha ruo awa atọ. Ha jikwa awa atọ nke ọzọ kwupụta mmehie ha, na ife Onyenwe anyị Chineke ha ofufe.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.