Ọnụọgụgụ 1

Gị na Erọn ga-agụkọta ndị ikom Izrel niile gbara iri afọ abụọ maọbụ karịa ọnụ, bụ ndị tozuru ije agha. Unu ga-edo ha nʼusuu, nʼusuu.

Numbers 1:3 (UKJV) From twenty years old and upward, all that are able to go forth to war in Israel: you and Aaron shall number them by their armies.

1Onyenwe anyị gwara Mosis okwu nʼọzara Saịnaị, nʼime ụlọ nzute, nʼụbọchị nke mbụ, nʼọnwa nke abụọ nke afọ abụọ, mgbe ụmụ Izrel pụtachara site nʼobodo Ijipt. Ọ sịrị,

2“Gaa gụọ ma chọpụta ọnụọgụgụ ndị ikom niile e nwere nʼetiti ọgbakọ Izrel, dịka ebo ha na agbụrụ ha si dị, na dịka ezinaụlọ ha si dịkwa. Depụta aha nwoke ọbụla nʼotu na otu.

3Gị na Erọn ga-agụkọta ndị ikom Izrel niile gbara iri afọ abụọ maọbụ karịa ọnụ, bụ ndị tozuru ije agha. Unu ga-edo ha nʼusuu, nʼusuu.

4Otu nwoke, site nʼebo Izrel ọbụla, onye bụ onyendu ezinaụlọ, ga-esonyere unu nʼọrụ a.

5“Ndị a bụ aha ndị ikom ndị ahụ ga-enyere unu aka. “Site nʼebo Ruben, Elizọ na Shedeua,

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.