2“Gaa gụọ ma chọpụta ọnụọgụgụ ndị ikom niile e nwere nʼetiti ọgbakọ Izrel, dịka ebo ha na agbụrụ ha si dị, na dịka ezinaụlọ ha si dịkwa. Depụta aha nwoke ọbụla nʼotu na otu.
3Gị na Erọn ga-agụkọta ndị ikom Izrel niile gbara iri afọ abụọ maọbụ karịa ọnụ, bụ ndị tozuru ije agha. Unu ga-edo ha nʼusuu, nʼusuu.
4Otu nwoke, site nʼebo Izrel ọbụla, onye bụ onyendu ezinaụlọ, ga-esonyere unu nʼọrụ a.
5“Ndị a bụ aha ndị ikom ndị ahụ ga-enyere unu aka. “Site nʼebo Ruben, Elizọ na Shedeua,
6site nʼebo Simiọn, Shelumiel nwa Zurishadai,