13Nke a bụ njem mbụ ha mere dịka Onyenwe anyị si nye Mosis iwu banyere ije ha.
14Usuu ọmụma ụlọ ikwu nke ebo Juda buru ụzọ bulie ije a, nʼokpuru ọkọlọtọ ha. Nashọn, nwa Aminadab, bụ onyendu ha.
15Netanel nwa Zua bụ onyendu usuu ebo Isaka.
16Eliab nwa Helọn bụ onyendu usuu ebo Zebụlọn
17Mgbe ahụ, e wedara ụlọ nzute ahụ. Ụmụ Geshọn na Merari buru ya, bilikwaa ije ha.