Ọnụọgụgụ 10

Nke a bụ njem mbụ ha mere dịka Onyenwe anyị si nye Mosis iwu banyere ije ha.

Numbers 10:13 (UKJV) And they first took their journey according to the commandment of the LORD by the hand of Moses.

11Nʼụbọchị iri abụọ, nʼime ọnwa nke abụọ, nʼafọ nke abụọ, igwe ojii ahụ biliri site nʼelu ụlọ nzute nke igbe iwu ọgbụgba ndụ ahụ.

12Mgbe ahụ, ụmụ Izrel biliri ije site nʼọzara Saịnaị jegharịa site nʼotu ebe ruo nʼebe ọzọ tutu igwe ojii ahụ akwụsị nʼọzara Paran.

13Nke a bụ njem mbụ ha mere dịka Onyenwe anyị si nye Mosis iwu banyere ije ha.

14Usuu ọmụma ụlọ ikwu nke ebo Juda buru ụzọ bulie ije a, nʼokpuru ọkọlọtọ ha. Nashọn, nwa Aminadab, bụ onyendu ha.

15Netanel nwa Zua bụ onyendu usuu ebo Isaka.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.