12Mgbe ahụ, ụmụ Izrel biliri ije site nʼọzara Saịnaị jegharịa site nʼotu ebe ruo nʼebe ọzọ tutu igwe ojii ahụ akwụsị nʼọzara Paran.
13Nke a bụ njem mbụ ha mere dịka Onyenwe anyị si nye Mosis iwu banyere ije ha.
14Usuu ọmụma ụlọ ikwu nke ebo Juda buru ụzọ bulie ije a, nʼokpuru ọkọlọtọ ha. Nashọn, nwa Aminadab, bụ onyendu ha.
15Netanel nwa Zua bụ onyendu usuu ebo Isaka.
16Eliab nwa Helọn bụ onyendu usuu ebo Zebụlọn