34Igwe ojii Onyenwe anyị dị nʼelu ha nʼehihie mgbe ha si nʼọmụma ụlọ ikwu ha bilie ije.
35Mgbe ọbụla igbe ọgbụgba ndụ ahụ biliri ije, Mosis na-ekwu sị, “Bilie O Onyenwe anyị, ka ndị iro ya bụrụ ndị a chụsasịrị; ka ndị iro gị niile site nʼihu gị gbalaga.”
36Ma mgbe ọbụla igbe ọgbụgba ndụ bịara ebe izuike, Mosis na-ekwukwa sị, “Lọghachi O Onyenwe anyị, bịakwute ọtụtụ mmadụ ndị a, bụ imerime puku ndị Izrel.”