1Mgbe na-adịghị anya ụmụ Izrel bidoro itamu ntamu nʼihi ihe ike niile ha na-ezute nʼije ha. Ma ntamu a ruru Onyenwe anyị ntị. Nʼihi ya, Onyenwe anyị were iwe dị ukwuu megide ha. Ọkụ sitere nʼebe Onyenwe anyị nọ, ree nʼetiti ha, repịa ụfọdụ ndị bi nʼakụkụ ngwụsị ọmụma ụlọ ikwu ahụ.
2Mgbe nke a mere, ụmụ Izrel tikuru Mosis mkpu akwa. Mosis kpere ekpere nye Onyenwe anyị nʼihi ha, ọkụ ahụ kwụsịkwara.
3Nʼihi ya, a kpọrọ ebe ahụ Tabera, nʼihi ọkụ ahụ si nʼebe Onyenwe anyị nọ ree nʼetiti ha.