14Agaghị m ebulite ibu ịchịkọta ndị a niile nʼonwe m! Ibu a dị m arọ nke ukwuu.
15Ọ bụrụ na ị ga-esi otu a meso m mmeso, biko napụ m ndụ m ugbu a, nʼihi na ọnwụ m ga-egosi na m natara amara nʼebe ị nọ. Site nʼọnọdụ a ga-ewetara m mbibi wezuga m.”
16Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya, “Kpọkọta iri ndị okenye ụmụ Izrel asaa, ndị ị maara na ha bụ ndị ndu, na ndị nlekọta ije ozi nʼetiti ụmụ Izrel. Kpọta ha nʼụlọ nzute m ka ha soro gị guzoro.
17Aga m abịa nʼebe ahụ gwa gị okwu. Mgbe ahụ kwa, aga m ewere ụfọdụ nʼime Mmụọ m dị nʼime gị tinye nʼime iri ndị ndu asaa ahụ. Ha ga-enyere gị aka ibu ibu arọ nke ịchịkọta ụmụ Izrel. Nʼụzọ dị otu a, ọ gaghị abụkwa ibu dịrị naanị gị ibu.
18“Ugbu a, gwa ndị Izrel niile si ha, ‘Doonụ onwe unu nsọ, kwadoonụ maka echi, mgbe unu ga-ata anụ. Onyenwe anyị nụrụ mgbe unu kwara akwa sị, “A sịkwa na anyị nwere anụ anyị ga-ata. Ihe dịrị anyị mma nʼIjipt karịa otu ọ dị ugbu a.”