Ọnụọgụgụ 11

Ọ ga-ezuru ha ma ọ bụrụ na e gbuoro ha igwe ehi na atụrụ? Ọ bụ azụ niile nke dị nʼoke osimiri ga-ezuru ha ma egbuo ha niile nye ha?”

Numbers 11:22 (UKJV) Shall the flocks and the herds be slain for them, to suffice them? or shall all the fish of the sea be gathered together for them, to suffice them?

20Kama unu ga-eri ya otu ọnwa zuru ezu, ruo mgbe ọ ga-esi unu nʼimi sọpụta, ghọrọ unu ihe ịsọ oyi. Nʼihi na unu ajụla Onyenwe anyị, onye nọ nʼetiti unu, kwaa akwa nʼihu ya, sị, “Gịnị mere anyị ji site nʼala Ijipt pụta?” ’ ”

21Ma Mosis sịrị Onyenwe anyị, “Ọnụọgụgụ ndị ikom dị narị puku isii ndị ji ụkwụ eje ka m nọ nʼetiti ha, ma ị na-asị, ‘Aga m enye ha anụ otu ọnwa.’

22Ọ ga-ezuru ha ma ọ bụrụ na e gbuoro ha igwe ehi na atụrụ? Ọ bụ azụ niile nke dị nʼoke osimiri ga-ezuru ha ma egbuo ha niile nye ha?”

23Onyenwe anyị sịrị Mosis, “Aka Onyenwe anyị ọ dị mkpụmkpụ? Ugbu a, ị ga-ahụ ma m ga-emezu okwu m, maọbụ na m agaghị emezu ya.”

24Ya mere, Mosis pụrụ ga gwa ụmụ Izrel ihe Onyenwe anyị kwuru. Ọ chịkọtara iri ndị okenye asaa ahụ nye ha ọnọdụ gburugburu ụlọ nzute ahụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.