Ọnụọgụgụ 11

Ma mmadụ abụọ nʼime iri ndị okenye asaa ndị ahụ, Eldad na Medad nọgidere nʼọmụma ụlọ ikwu ha. Ọ bụ ezie na e depụtara aha ha dịka ndị ndu, ma ha esoghị ndị ọzọ gaa nʼụlọ nzute. Ma Mmụọ ahụ bịakwasịrị ha nʼebe ahụ ha nọ. Ha bukwara amụma.

Numbers 11:26 (UKJV) But there remained two of the men in the camp, the name of the one was Eldad, and the name of the other Medad: and the spirit rested upon them; and they were of them that were written, but went not out unto the tabernacle: and they prophesied in the camp.

24Ya mere, Mosis pụrụ ga gwa ụmụ Izrel ihe Onyenwe anyị kwuru. Ọ chịkọtara iri ndị okenye asaa ahụ nye ha ọnọdụ gburugburu ụlọ nzute ahụ.

25Mgbe ahụ, Onyenwe anyị rịdatara nʼime igwe ojii. Ya na Mosis kparịtaa ụka. Onyenwe anyị weere ụfọdụ nʼime Mmụọ dị nʼime Mosis, tinye ya nʼime iri ndị okenye asaa ndị ahụ. Mgbe Mmụọ a batara nʼime ha, ha niile buru amụma. Ma ha ebughị amụma gaa nʼihu.

26Ma mmadụ abụọ nʼime iri ndị okenye asaa ndị ahụ, Eldad na Medad nọgidere nʼọmụma ụlọ ikwu ha. Ọ bụ ezie na e depụtara aha ha dịka ndị ndu, ma ha esoghị ndị ọzọ gaa nʼụlọ nzute. Ma Mmụọ ahụ bịakwasịrị ha nʼebe ahụ ha nọ. Ha bukwara amụma.

27Otu okorobịa gbapụrụ ọsọ gaa kọọrọ Mosis sị ya, “Eldad na Medad na-ebu amụma nʼọmụma ụlọ ikwu ha.”

28Joshua nwa Nun, onyeozi Mosis site na mgbe ọ bụ okorobịa, gwara Mosis okwu sị ya, “Onyenwe m Mosis, mee ka ndị a kwụsị ibu amụma.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.