Ọnụọgụgụ 11

Joshua nwa Nun, onyeozi Mosis site na mgbe ọ bụ okorobịa, gwara Mosis okwu sị ya, “Onyenwe m Mosis, mee ka ndị a kwụsị ibu amụma.”

Numbers 11:28 (UKJV) And Joshua the son of Nun, the servant of Moses, one of his young men, answered and said, My lord Moses, forbid them.

26Ma mmadụ abụọ nʼime iri ndị okenye asaa ndị ahụ, Eldad na Medad nọgidere nʼọmụma ụlọ ikwu ha. Ọ bụ ezie na e depụtara aha ha dịka ndị ndu, ma ha esoghị ndị ọzọ gaa nʼụlọ nzute. Ma Mmụọ ahụ bịakwasịrị ha nʼebe ahụ ha nọ. Ha bukwara amụma.

27Otu okorobịa gbapụrụ ọsọ gaa kọọrọ Mosis sị ya, “Eldad na Medad na-ebu amụma nʼọmụma ụlọ ikwu ha.”

28Joshua nwa Nun, onyeozi Mosis site na mgbe ọ bụ okorobịa, gwara Mosis okwu sị ya, “Onyenwe m Mosis, mee ka ndị a kwụsị ibu amụma.”

29Ma Mosis zara sị, “Ọ bụ nʼihi ikwochitara m ekworo ka i ji chọọ ka m kwụsị ha? Ọ gaara atọ m ụtọ ma a sị na ndị Onyenwe anyị niile bụ ndị amụma, ndị Onyenwe anyị ga-etinye Mmụọ ya nʼime ha!”

30Mgbe ahụ Mosis na ndị okenye Izrel ndị ahụ niile lọghachiri nʼebe ụlọ ikwu ha dị.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.