Ọnụọgụgụ 11

Ndị amakekwu so ụmụ Izrel nʼije a malitere itamu ntamu banyere nri ndị ọzọ na-agụ ha agụụ. Nke a mere ka ụmụ Izrel malite ịkwa akwa, na-asị, “A sịkwarị na anyị nwere anụ anyị ga-ata.

Numbers 11:4 (UKJV) And the mixt multitude that was among them fell a lusting: and the children of Israel also wept again, and said, Who shall give us flesh to eat?

2Mgbe nke a mere, ụmụ Izrel tikuru Mosis mkpu akwa. Mosis kpere ekpere nye Onyenwe anyị nʼihi ha, ọkụ ahụ kwụsịkwara.

3Nʼihi ya, a kpọrọ ebe ahụ Tabera, nʼihi ọkụ ahụ si nʼebe Onyenwe anyị nọ ree nʼetiti ha.

4Ndị amakekwu so ụmụ Izrel nʼije a malitere itamu ntamu banyere nri ndị ọzọ na-agụ ha agụụ. Nke a mere ka ụmụ Izrel malite ịkwa akwa, na-asị, “A sịkwarị na anyị nwere anụ anyị ga-ata.

5Anyị chetara azụ anyị tara nʼIjipt, nke na-adịghị efu anyị ego, ya na kukumba, na melọn, na liik, na ayo na galiik.

6Ma ugbu a, anyị enweghịkwa agụụ iri nri, nʼihi na site nʼụbọchị ruo nʼụbọchị, ọ bụ naanị mánà bụ ihe oriri anyị nwere.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.