12Ekwela ka Miriam dịrị ka nwa ọhụrụ nwụrụ anwụ nke akpụkpọ ahụ ya rere ure nʼoge o si nʼakpanwa nne ya na-apụta.”
13Ya mere Mosis tikuru Onyenwe anyị mkpu akwa sị ya, “Chineke, biko, gwọọ ya!”
14Ma Onyenwe anyị zara Mosis sị ya, “Ọ bụrụ na nna ya gbụrụ ya asụ nʼihu, ọ gaghị abụ onye rụrụ arụ abalị asaa? Ya mere, hapụ ya ka ọ bụrụ onye e sitere nʼogige ọmụma ụlọ ikwu Izrel wezuga abalị asaa. Mgbe oge a gafesịrị, o nwere ike ịlọghachi.”
15Ya mere e wezugara Miriam site nʼogige ọmụma ụlọ ikwu Izrel abalị asaa. Ndị Izrel niile nọdụrụ chere ya ruo mgbe ọ lọghachiri, tutu ha ebilie nʼije ọzọ.
16Mgbe ihe ndị a gasịrị, ha hapụrụ Hazerọt rute nʼọzara Paran ebe ha wuru ogige ụlọ ikwu ha.