Ọnụọgụgụ 12

Onyenwe anyị gwara ha sị, “Geenụ ntị nʼokwu m ndị a: “Mgbe onye amụma nọ nʼetiti unu, Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị na-egosi ya onwe m site nʼọhụ. Ana m agwa ya okwu site na nrọ.

Numbers 12:6 (UKJV) And he said, Hear now my words: If there be a prophet among you, I the LORD will make myself known unto him in a vision, and will speak unto him in a dream.

4Na mberede, Onyenwe anyị sịrị Mosis, na Erọn, na Miriam, “Pụtanụ, bịa nʼụlọ nzute, unu mmadụ atọ” Ya mere ha atọ pụtara.

5Mgbe ahụ, Onyenwe anyị rịdatara nʼime igwe ojii, guzoro na mbata ọnụ ụzọ ụlọ nzute ahụ, kpọpụta Erọn na Miriam. Mgbe ha abụọ bịara nso.

6Onyenwe anyị gwara ha sị, “Geenụ ntị nʼokwu m ndị a: “Mgbe onye amụma nọ nʼetiti unu, Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị na-egosi ya onwe m site nʼọhụ. Ana m agwa ya okwu site na nrọ.

7Ma nʼebe ohu m Mosis nọ, o sighị otu a dịrị, ọ bụ onye kwesiri ntụkwasị obi nʼụlọ m niile.

8Nʼebe ọ nọ, ana m agwa ya okwu ihu na ihu nʼụzọ doro anya, ọ bụghị site nʼilu, ọ na-ahụkwa ụdịdị Onyenwe anyị. Gịnị mere ụjọ atụghị unu ikwu okwu megide ohu m Mosis?”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.